Abù Ọma 40:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ;Nti abua ka I ràpúworom:Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.

7. Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom;N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem:

8. Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke;Iwu-Gi di kwa nime obim.

9. Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba;Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua,Jehova, Gi onwe-gi amawo.

10. Ekpuchighm ezi omume-Gi nime obim;Ekwusawom ikwesi-ntukwasi-obi-Gi na nzọputa-Gi:Ezonarighm nkpọkọta-Gi bara uba ebere-Gi na ezi-okwu-Gi

11. Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile:Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile.

12. N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu,Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ;Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam.

Abù Ọma 40