10. Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum.
11. Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.
12. Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà;Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche,Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.
13. Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe;Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.
14. E, adim ka madu nke nādighi-anu iheOnye iba-nba ọ bula nādighi n'ọnu-ya.