3. Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.
4. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.
5. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.
6. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.