22. N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.
23. Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.
24. Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.
25. Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye;Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.
26. Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.