Abù Ọma 37:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.

18. Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.

19. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.

20. N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì,Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.

21. Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.

Abù Ọma 37