Abù Ọma 37:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ,Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo.

2. N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa,Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.

3. Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.

4. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.

5. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.

Abù Ọma 37