Abù Ọma 35:23-27 Bible Nso (IGBOB)

23. Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m,Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.

24. Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem;Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.

25. Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi:Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.

26. Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim:Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.

27. Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ:Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ.

Abù Ọma 35