Abù Ọma 35:12-26 Bible Nso (IGBOB)

12. Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.

13. Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe:Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu;Ekperem nālaghachikute kwa obim.

14. Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri:Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.

15. Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha:Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi;Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:

16. Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha,Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.

17. Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya?Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim,Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya.

18. M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba:N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi.

19. Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu:Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.

20. N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu:Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.

21. Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem;Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.

22. I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti:Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.

23. Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m,Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.

24. Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem;Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.

25. Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi:Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.

26. Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim:Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.

Abù Ọma 35