Abù Ọma 35:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù:Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.

2. Jide ọta na ọta uku,Bilie iyerem aka.

3. Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum:Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu.

4. Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike:Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.

5. Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe,Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.

Abù Ọma 35