Abù Ọma 33:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Bùkueune Ya abù ọhu;Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma.

4. N'ihi na okwu Jehova ziri ezi;Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi.

5. Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya:Uwa juputara n'ebere jehova.

6. Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe;Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.

7. Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe:Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.

8. Ka uwa nile tua egwu Jehova:Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya.

Abù Ọma 33