17. Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu:Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.
18. Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya,Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya;
19. Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu,Na idebe ha ndu n'oké unwu.
20. Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova:Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu.
21. N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu,N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi.