14. Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-YaLekwasi ndi nile bi n'uwa anya;
15. Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n'otù,Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile.
16. Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa:Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.
17. Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu:Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.
18. Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya,Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya;
19. Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu,Na idebe ha ndu n'oké unwu.
20. Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova:Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu.