5. Olu Jehova nētiwa osisi cedar;Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.
6. Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi;Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.
7. Olu Jehova nāwaputa ire ọku.
8. Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu;Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.
9. Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele,Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia:Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube.