Abù Ọma 25:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. Chem iru, me-kwa-ram amara;N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu.

17. Ahuhu nile nke obim sara mbara:Me ka m'si na nkpàm nile puta.

18. Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm;Bupu kwa nmehiem nile.

19. Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu;Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.

20. Debe nkpuru-obim, naputakwam:Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.

21. Ka izu-okè na izi-ezi chezim,N'ihi na elewom anya Gi.

Abù Ọma 25