17. Anamagu ọkpukpum nile ọnu;Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:
18. Ha nēkère onwe-ha uwem,N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà.
19. Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya:Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.
20. Naputa nkpuru-obim na mma-agha;Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita.
21. Zọputam n'ọnu ọdum;Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.
22. Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi:N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi.
23. Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya;Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya;Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel.
24. N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú;O zonarighi kwa ya iru-Ya;Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.
25. N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba:M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya.
26. Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ:Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya:Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.
27. Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova:Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi.
28. N'ihi na ọ bu Jehova nwe ala-eze:Ọ nāchi kwa mba nile.
29. Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala:N'iru Ya ka ndi nile ndi nārida n'ájá gēruru ala,Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu.