Abù Ọma 22:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum?N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya?

2. Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza;N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere.

3. Ma Gi onwe-gi di nsọ,Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze.

4. Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi:Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu.

5. Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha:Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha.

6. Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu;Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya.

Abù Ọma 22