Abù Ọma 22:1-19 Bible Nso (IGBOB)

1. Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum?N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya?

2. Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza;N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere.

3. Ma Gi onwe-gi di nsọ,Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze.

4. Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi:Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu.

5. Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha:Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha.

6. Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu;Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya.

7. Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi:Ha na-enu ọnu, fufè isi, si,

8. Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu:Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ.

9. Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem:I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem.

10. Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa:Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem.

11. Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso;N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.

12. Ọtutu oke-ehi dim buruburu:Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.

13. Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum,Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja.

14. Dika miri ka awusiworom,Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha:Obim aghọwo ihe dika wax;Ọ lọwo miri n'etiti afọm.

15. Ikem akpọwo nku di ka osisi;Irem nārapara kwa n'ab͕am;Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.

16. N'ihi na nkita dim buruburu:Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu;Ha nādupú akam abua na ukwum abua.

17. Anamagu ọkpukpum nile ọnu;Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:

18. Ha nēkère onwe-ha uwem,N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà.

19. Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya:Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.

Abù Ọma 22