1. N'ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu?N'ìhi gini ka ndi nile di n'uwa nātughari ihe-efu n'uche?
2. Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha,Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù,Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,
3. Ka ayi tijie ab͕u nile ha,Tufue udọ̀ nile ha n'aru ayi.
4. Onye nānọdu n'elu-igwe nāchi ọchì:Onye-nwe-ayi nākwa ha emò.
5. Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n'iwe-Ya,Ọ bu kwa n'iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji: