Abù Ọma 18:42-47 Bible Nso (IGBOB)

42. Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe:Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.

43. I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdom onye-isi mba nile ọzọNdi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.

44. Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.

45. Ndi ala ọzọ nāta aru,Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta.

46. Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;Chineke nke nzọputam di kwa elu:

47. Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.

Abù Ọma 18