37. Anamachu ndi-irom, we rue ha aru:Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
38. Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:Ha nāda n'okpuru ukwum abua.
39. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
40. Ndi-irom, I nyewokwam olu-haNdi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
41. Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.
42. Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe:Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.