Abù Ọma 18:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem.

2. Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu;Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.

3. Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova:Ewe zọputam n'aka ndi-irom.

4. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu.

Abù Ọma 18