1. Tonu Ja.Bùkuenu Jehova abù ọhu,Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya.
2. Ka Israel ṅuria n'Onye meworo ya:Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n'Eze-ha.
3. Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú:Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.
4. N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ:Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma.