Abù Ọma 148:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu:Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:

9. Ugwu nile na ugwu ntà nile;Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:

10. Anu-ọhia na anu-ulo nile;Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:

11. Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche;Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa:

12. Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ;Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:

13. Ka ha too aha Jehova;N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya:Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe.

Abù Ọma 148