Abù Ọma 148:2-10 Bible Nso (IGBOB)

2. Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile:Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.

3. Tonu Ya, anyanwu na ọnwa:Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.

4. Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe,Na miri nke di n'elu elu-igwe.

5. Ka ha to aha Jehova:N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.

6. O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi:Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.

7. Tonu Jehova site n'uwa,Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:

8. Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu:Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:

9. Ugwu nile na ugwu ntà nile;Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:

10. Anu-ọhia na anu-ulo nile;Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:

Abù Ọma 148