7. Werenu ekele za Jehova,Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:
8. Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe,Onye nēdoziri ala miri-ozuzo,Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.
9. Ọ nēnye anumanu nri-ya,Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya.
10. Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ:Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.
11. Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya,Ndi nēchere ebere-Ya.
12. Gi Jerusalem, nāja Jehova;To Chineke-gi, Zaion.
13. N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.
14. Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.
15. Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa;Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.