1. Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di.Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú;Ọ dighi onye nēme ezi ihe.
2. Jehova siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya,Ihu ma ọ di onye nwere uche,Nke nāchọ Chineke.
3. Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n'otù dika miri;Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.