Abù Ọma 139:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi?Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga?

8. Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ:Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu.

9. Ọ buru na achirim nkù nke ututu,Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri,

10. Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum,Aka-nri-gi gējidekwam.

11. M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim;Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.

12. Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi;Ma abali nēnye ìhè dika ehihie:Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi

13. N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua:I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà.

14. M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu:Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di;Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.

Abù Ọma 139