3. Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka,Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma.
4. N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem,Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.
5. N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum.
6. Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube;Ọ dika elu, apughm iru ya.