Abù Ọma 139:15-18 Bible Nso (IGBOB)

15. Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi,Mb͕e emerem na nzuzo,Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.

16. Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè,Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru,Nke akpuru kwa-ubọchi,Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.

17. Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n'anyam, Chineke!Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne!

18. Ọ buru na aguam ha ọnu, ha bara uba kari ájá:Mb͕e m'tetaworo, mu na I nānọgide.

Abù Ọma 139