Abù Ọma 139:14-17 Bible Nso (IGBOB)

14. M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu:Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di;Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.

15. Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi,Mb͕e emerem na nzuzo,Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.

16. Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè,Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru,Nke akpuru kwa-ubọchi,Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.

17. Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n'anyam, Chineke!Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne!

Abù Ọma 139