2. M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di,M'gēkele kwa aha-Gi n'ihi ebere-Gi na n'ihi ezi-okwu-Gi:N'ihi na I mewo ka okwu-ọnu-Gi di uku n'elu aha-Gi nile.
3. N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram,I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem.
4. Eze nile nke uwa gēkeli Gi, Jehova,N'ihi na ha anuwo okwu nile nke ọnu-Gi.
5. Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova;N'ihi na ebube Jehova di uku.