Abù Ọma 135:8-14 Bible Nso (IGBOB)

8. Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n'ala Ijipt,Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo.

9. O zitere ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'etiti gi, Ijipt,N'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile.

10. Onye tib͕uru ọtutu mba,B͕u kwa ndi-eze di ike;

11. Bú Saihon eze ndi-Amorait,Na Og eze Beshan,Na ala-eze nile nke Kenean:

12. Ọ we nye ala-ha ibu ihe-nketa,Iburu Israel, bú ndi-Ya, ihe-nketa.

13. Jehova, aha-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi;Jehova, ncheta-Gi nādiru ọb͕ọ nile.

14. N'ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe,Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya.

Abù Ọma 135