Abù Ọma 135:3-12 Bible Nso (IGBOB)

3. Tonu Ja; n'ihi na Jehova di nma:Bùkuenu aha-Ya abù ọma; n'ihi na ọ di utọ.

4. N'ihi na Jekob ka Ja rọputaworo nye Onwe-ya,Ọ rọputara Israel ka ọ buru ihe nke aka Ya.

5. N'ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku,Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile.

6. Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo,N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile.

7. Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo;O meworo miri-ozuzo àmùmà;Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.

8. Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n'ala Ijipt,Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo.

9. O zitere ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'etiti gi, Ijipt,N'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile.

10. Onye tib͕uru ọtutu mba,B͕u kwa ndi-eze di ike;

11. Bú Saihon eze ndi-Amorait,Na Og eze Beshan,Na ala-eze nile nke Kenean:

12. Ọ we nye ala-ha ibu ihe-nketa,Iburu Israel, bú ndi-Ya, ihe-nketa.

Abù Ọma 135