14. N'ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe,Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya.
15. Arusi nile nke mba nile bu ọla-ọcha na ọla-edo,Ọlu aka madu.
16. Ha nwere ọnu ma ha adighi-ekwu okwu;Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;
17. Ha nwere nti abua, ma ha adighi-aṅa nti;Ọ dighi kwa iku-ume di n'ọnu-ha.
18. Ndi nēme ha gādi ka ha;E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.
19. Ulo Israel, gọzienu Jehova:Ulo Eron, gọzienu Jehova:
20. Ulo Livai, gọzienu Jehova:Unu ndi nātu egwu Jehova, gọzienu Jehova.