42. M'gāza kwa onye nātam uta okwu;N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi.
43. Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum;N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo.
44. M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nileRue mb͕e nile ebighi-ebi.
45. M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara;N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
46. M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze,Ihere agaghi-emekwam.