132. Chem iru, me-kwa-ram amara,Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya.
133. Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi:Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim.
134. B͕aputam na nmeb͕u nke madu:M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile.
135. Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè;Zíkwam ukpuru-Gi nile.
136. Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua,N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.
137. Onye ezi omume ka I bu Jehova,Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.
138. I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omumeNa ikwesi-ntukwasi-obi di uku.
139. Ekworom ekpochapuwom,N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.