Abù Ọma 118:10-26 Bible Nso (IGBOB)

10. Mba nile ab͕awom buruburu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

11. Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

12. Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu:N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

13. I nudawom enuda ka m'we da:Ma Jehova yerem aka.

14. Ikem na abù ọmam ka Ja bu:Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.

15. Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume:Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.

16. Ebuliwo aka-nri Jehova elu:Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.

17. M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu,M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.

18. Ja adọwom aka na nti nke-uku:Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.

19. Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume:M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.

20. Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere;Ndi ezi omume gābà nime ya.

21. M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom,I we ghọrọm nzọputa.

22. Nkume nke ndi nēwu ulo juruAghọwo isi nkuku ulo.

23. Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere;Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.

24. Nka bu ubọchi Jehova meworo;Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.

25. Biko, Jehova, zọputa, biko:Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.

26. Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova:Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.

Abù Ọma 118