Abù Ọma 116:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere,Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.

15. Ihe di oké ọnu-ahia n'anya JehovaKa ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.

16. Ariọm I, Jehova, n'ihi na mu onwem bu orù-Gi:Mu onwem bu orù-Gi, na nwa nke orù-Gi nwayi;I tọpuwo ab͕um nile.

17. Gi ka m'gāchuru aja ekele,Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.

18. Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere,Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile;

Abù Ọma 116