Abù Ọma 115:3-11 Bible Nso (IGBOB)

3. Ma Chineke-ayi nọ n'elu-igwe:Ihe nile nke tọrọ Ya utọ ka O meworo.

4. Arusi nile ha bu ọla-ọcha na ọla-edo,Ọlu aka madu.

5. Ha nwere ọnu, ma ha adighi-ekwu okwu;Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;

6. Ha nwere nti abua, ma ha adighi-anu ihe;Ha nwere imi, ma ha adighi-anuta ísì;

7. Ha nwere aka-ha abua, ma ha adighi-ebitu ihe;Ha nwere ukwu-ha abua, ma ha adighi-eje ije;Ha adighi-ewere akpiri-ha me uṅara.

8. Ndi nēme ha gādi ka ha:E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.

9. Israel, tukwasi Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.

10. Ulo Eron, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ọta-ha ka Ọ bu.

11. Unu ndi nātu egwu Jehova, tukwasinu Jehova obi:Iye-aka-ha na ota-ha ka Ọ bu.

Abù Ọma 115