Abù Ọma 115:12-16 Bible Nso (IGBOB)

12. Jehova echetawo ayi: Ọ gāgọzi ayi:Ọ gāgọzi ulo Israel;Ọ gāgọzi ulo Eron.

13. Ọ gāgọzi ndi nātu egwu Jehova,Ma ndi ntà ma ndi uku.

14. Ka Jehova tukwasiri unu madu,Ka Ọ tukwasiri unu, tukwasi-kwa-ra umu-unu.

15. Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu,Onye meworo elu-igwe na uwa.

16. Elu-igwe bu elu-igwe Jehova nwere;Ma uwa ka O nyeworo umu madu.

Abù Ọma 115