3. Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu:Ezi omume-Ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
4. Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile:Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu.
5. Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya:Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi.
6. O gosiwo ndi-Ya ike nke ọlu-Ya nile,N'inye ha ihe-nketa mba nile.
7. Ọlu nile nke aka-Ya bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi;Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ukpuru-Ya nile bu.
8. Ihe anākwagide rue mb͕e nile ebighi-ebi ka ha bu,Ha bu ihe anēme n'ezi-okwu na izi-ezi.
9. Nb͕aputa ka O ziteworo ndi-Ya;O nyewo ọb͕ub͕a-ndu-Ya iwu rue mb͕e ebighi-ebi:Ihe di nsọ na ihe anātu egwu ka aha-Ya bu.