Abù Ọma 111:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Tonu Ja.M'gēwere obim nile kele Jehova,N'ìzu nzuzo nke ndi ziri ezi, na nime nzukọ Israel.

2. Ọlu nile nke Jehova di uku,Buru ihe ndi nile ha nātọ utọ nāchọputa.

3. Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu:Ezi omume-Ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

4. Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile:Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu.

5. Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya:Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi.

6. O gosiwo ndi-Ya ike nke ọlu-Ya nile,N'inye ha ihe-nketa mba nile.

Abù Ọma 111