4. Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ,Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di;Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.
5. Jehova n'anwa onye ezi omume:Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì.
6. Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo;Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha.