8. Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.
9. Ka umu-ya buru umu-nb͕ei,Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.
10. Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ;Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya.
11. Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà;Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha.
12. Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.