Abù Ọma 109:12-17 Bible Nso (IGBOB)

12. Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.

13. Ka eriri-umu-ya diri nbipu;N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.

14. Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà;Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.

15. Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile,Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa.

16. N'ihi na o chetaghi ime ebere,O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye,Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua.

17. Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya;Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ.

Abù Ọma 109