Abù Ọma 107:20-25 Bible Nso (IGBOB)

20. O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma,O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.

21. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

22. Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele,Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.

23. Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o,Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;

24. Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova,Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.

25. N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ,Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.

Abù Ọma 107