13. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.
14. O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.
15. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
16. N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla,B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.