5. Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo,Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi,Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi.
6. Ayi esowo nna-ayi-hà mehie,Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu.
7. Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt;Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile;Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie.
8. Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya,Ime ka amara idi-ike-Ya.
9. O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia:O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara.
10. O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì,B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha.
11. Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha:Ọ dighi otù onye nime ha fọduru.
12. Ha we kwere okwu-Ya nile;Ha nābù abù otuto-Ya.
13. Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa;Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:
14. Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara,We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu.
15. O we nye ha ihe ha riọrọ;Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha.
16. Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha,Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova.
17. Ala nēmeghe, we loda Detan,Kpuchi kwa nzukọ Abairam.