Abù Ọma 103:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi;Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.

17. Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya,Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu;

18. Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya,Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.

19. Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe;Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile.

20. Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya,Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya,N'ige nti olu nke okwu-Ya.

21. Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile;Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ.

Abù Ọma 103