21. Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion,Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;
22. Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù,Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè.
23. O wedawo ikem n'uzọ;O bilatawo ubọchim nile.
24. Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile:N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide.
25. Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.
26. Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide:Ha nile gāka kwa nká dika uwe;Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha:
27. Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu